browsetext-to-speech

Want to know what "ba" means in Igbo? View the translations below.

-bà

Translates to
enter 

verb

to come or go into
"the boat entered an area of shallow marshes"
Not to be Confused With
-báchastise
Sentences

Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.

Because of this, if your eyes try to lead you into sin, throw it away. It is better for you to enter the kingdom of heaven with one eye than with two eyes to go to hell.

Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ.

If your right hand wants to make you sin, get rid of it. It is better for you to enter the kingdom of heaven with one hand than with two hands.

Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu.

Instead, when you want to pray, go into your room and close the door, pray to God your Father in secret. He knows the secrets of your heart. He will also answer your prayers and give you the reward you deserve.

“Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.

“Not everyone who calls me by name says 'Lord, Lord' will enter the Kingdom of Heaven, but only those who do what my Father in heaven wants them to do.

Mgbe Jisọs chọrọ ịbanye na Kapanọm, otu ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya nwoke, onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye nọkwa nꞌoge ahụ nꞌoke ihe mgbu.

When Jesus was about to enter Capernaum, a centurion came to him and asked him to come and heal his servant, who had been crippled, and was in pain.

Ma ọchịagha ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Ekwesịghị m ka ị bata nꞌụlọ m. Nanị nọdụ nꞌebe a kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa ohu m nwoke ike.

But the officer spoke to Jesus and said, “I do not need you to come into my house. Just sit here and speak, and my servant will feel fine.

Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs arịrịọ sị ya, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nꞌime ezi ndị a.”

These demons begged Jesus, "If you cast us out, please let us go into these good ones."

Jisọs banyekwara nꞌụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo na Kapanọm.

And Jesus entered into a ship with him, and came to Capernaum.

Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌụlọ Matiu iri nri. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sooro Jisọs nọdụ na-eri nri.

Later, Jesus and his disciples have entered Matthew's home for a meal. Many others, even tax collectors and sinners, were reclining with Jesus.

Ma mgbe ndị nọ nꞌebe ahụ pụrụ dị ka a gwara ha, Jisọs banyere nꞌụlọ ebe nwanta nwanyị ahụ dina. O jidere ya nꞌaka, selite ya elu. Nwanta nwanyị ahụ dịkwara ndụ ọzọ.

But when those who were in the house went out as they were told, Jesus entered into the house where the sister was lying. He grabbed her by the arm, lifting her up. The girl was alive again.

Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya.

From the time of John the Baptist began preaching until now, the world has been powerfully hindering the progress of the kingdom of heaven. But it is also the only people with whom he or she has a strong desire to enter it.

Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ.

Likewise, if some demons in the kingdom of the devil are fighting against one another, this shows them the fall of the kingdom, for a terrible division has come into the kingdom.

Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo nile dị nꞌụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ. Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo nile dị nꞌụlọ nwoke ahụ.

No man could enter the house of a mighty man to plunder all the goods in the house. But he could do this if he would first bind the man. After being bound, he can enter and accumulate all the goods in the man's house.

Ma mkpụrụ dara nꞌala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nꞌozi ọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-apụ kpọta iri mmadụ anọ, ma ọ bụ iri mmadụ isii, ma ọ bụ narị mmadụ, ndị a ga-eme ka ha baa nꞌalaeze ahụ.”

But the good seed represents the heart of a person who listens to the message and understands it. And he went away, and fetch forty, or sixty, or hundred men, that are to go into the kingdom.

Emesịa, Jisọs hapụrụ igwe mmadụ ahụ nꞌezi baa nꞌụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nꞌubi a kụrụ ọka.”

Later, Jesus lets the crowds go into the house. His disciples came to him and said: "Explain the meaning of the parable to us, a parable about a field that has a field of wheat."

Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma igwe mmadụ ndị si obodo dị iche iche nụrụ ya soro ya, kama ha si ụzọ elu ala jeruo ebe ọ nọ.

When Jesus heard this, he entered into a boat, into the desert, where he would be by himself. But a great crowd of people from around the town had news of what had happened, and they went with Jesus on the road.

Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbụ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.

After this, Jesus tells his disciples to get into the boat and start across the river. But he himself sat for sending the people.

Ọ̀ ga-abụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla mmadụ riri nꞌọnụ ya na-abanye ya nꞌime afọ, emesịa o sitekwa ya nꞌike pụọ?

Do ye not yet understand, that whatsoever entereth into the belly it cannot enter into its belly;

Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe.

Then Jesus said to his disciples, "Unless you repent of your sins as young children, you will not enter into the kingdom of heaven.

Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ.

For this reason, if your hand or your foot causes you to sin, cut it off and throw it away. You are better off entering the Kingdom of Heaven with no hands and feet, than with hands and feet with hell.

Related Words
Near-By Words