browsetext-to-speech

Want to know what "iwu" means in Igbo? View the translations below.

ìwú

Translates to
law 

noun

the collection of rules imposed by authority
"civilization presupposes respect for the law"
"the great problem for jurisprudence to allow freedom while enforcing order"
Sentences

Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”

Herod called the chief priests and the teachers of the law and asked them, "Where do the prophets say that the Savior will be born?"

E sitekwara nꞌiwu a Herọd nyere mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,

And this was done through the law which Herod gave to Jeremiah:

“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.

“Do not think that I have come to abolish the Mosaic Law, or to cancel the warning of the prophets. I did not come to cancel, but I came to fulfill them.

Ana m ekwusi nke a ike na tutuu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị iwu ọ bụla ga-agafe ma o mezughị.

I assert this by saying that the universe is gone, no law can be passed without it.

Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.

Therefore, if anyone violates the lesser laws, and commands others to break them, that person will be counted in the least in the kingdom of heaven. But anyone who teaches someone to obey the law and keep God's word, he will be called great in the Kingdom of Heaven.

“Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị.

“Let me warn you. If your righteousness is more evident than the righteousness of the Pharisees and the teachers of the law, you will certainly not inherit the kingdom of heaven.

Iwu Mosisi sị onye ọ bụla egbula mmadụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla egbuo mmadụ, a ga-akpọta ya nꞌihu ndị ga-ekpe ya ikpe.

“The Mosaic Law said that nobody should kill. If anyone kills anyone, he will be brought before the people who will judge him.

Iwu Mosisi sịrị onye ọ bụla akwala iko.

“The Mosaic Law required that a person not practice adultery.

“Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya.

“Under the Mosaic law, if a man wishes to separate himself from his installation, he must first write a separation or an objection to him.

Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

But listen to the law I give. Every man who separates himself from his installation, which he has not kept in the place of fornication, has committed sin, because he puts the woman in a state of fornication. If the woman marries again, the man who marries her commits adultery.

“Nꞌime iwu Mosisi a sịrị unu mezuo iyi nile unu ṅụrụ nye Chineke.

“In the law of Moses it is said that you may fulfill your oaths to God.

Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’

“The Mosaic Law said, 'If anyone is blind, you can also have his eyes closed. And cast off the king who has crushed your king. '

Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.”

Jesus commanded the man, “Go to the chief priest, and tell no one on the way. Take your gifts along the way as stated in the Mosaic Law. Go see the chief priest, and tell the people that you are clean. ”

Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ihe iwu ahụ na ndị amụma kwuru, Jọn bụ Ịlaịja ahụ, nke ha gbara ama na ọ ga-abịa.

And if you are prepared to accept what the Law and the Prophets say, John is Elijah, whom they witness to come.

Ma ụfọdụ nꞌime ndị Farisịi hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a, gwa Jisọs sị, “Lee ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme! Ha na-emebi iwu! Ha na-aghọ ọka nꞌụbọchị izuike!”

But some of the Pharisees who saw them do this, and said to Jesus, “Behold, your disciples are doing this! They are breaking the law! They are like corn on the Sabbath day! ”

A gwara anyị nꞌakwụkwọ nsọ na Devidi na ndị enyi ya banyere nꞌime ụlọ nsọ Chineke rie beredi dị nsọ e ji chụọra Chineke aja. Beredi nke nanị ndị nchụaja kwesịrị iri. Ma Devidi mebiri iwu site nꞌiri beredi ahụ, ya na ndị so ya.

We are told in the Bible that David and his companions ate the sacred bread of God at the temple. Bread that only priests should eat. But David broke the law by eating the bread, together with his men.

Ọzọ, ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nꞌime akwụkwọ iwu Mosisi na ndị nchụaja na-emebi iwu site nꞌịrụ ọrụ nꞌụbọchị izuike? Ma ọ dịghị onye na-agụ ha dị ka ndị na-emebi iwu.

Also, have you not read in the book of the law of Moses that the priests in law practice the sabbath day? But no one considers them to be wicked.

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs okwu sị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ọrụ ebube ọzọ.”

Then some of the teachers of the law and the Pharisees spoke to Jesus, saying: “Teacher, we want to show you another miracle.”

Jisọs sịrị ha, “Ya mere, onye ozizi iwu Mosisi ọ bụla soro bụrụ onye na-eso ụzọ nke alaeze eluigwe, ga-adị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nꞌọba ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”

Jesus said to them, "Therefore every teacher of the law of Moses who is a disciple of the kingdom of the heavens shall be like a master of the house, bringing forth new things and old things."

Nꞌọmenala unu onye mere ihe dị otu a mere ihe ziri ezi, mgbe ọ jụrụ iji ihe o nwere sọpụrụ ndị mụrụ ya. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ̀ bụghị na unu emeela ka iwu Chineke bụrụ ihe dị ala karịa omenala unu?

It is natural for a person who does what is right to honor his parents. What does this indicate? Have you made the law of God inferior to your own culture?

Related Words
Near-By Words