browsetext-to-speech

Want to know what "iru" means in Igbo? View the translations below.

írú

Also:íhú
Translates to
front 

noun

the side that is forward or prominent
face 

noun

the front of the human head from the forehead to the chin and ear to ear
"he washed his face"
"I wish I had seen the look on his face when he got the news"
Sentences

“Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha.

“As for fasting, when you fast, do not be like the dead, or the hungry. This is what hypocrites do. They make their faces appear to be fasting. May this be a pity to them. Of course, the compassion that people have for them is really a reward.

Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.

Hypocritical! First remove the items you love so you can see the way to look out of your brother's eye.

“Onye ọ bụla nabatara m nꞌihu mmadụ nile dị ka enyi ya, ka mụ onwe m ga-anabatakwa dị ka enyi m nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe.

“Whoever receives me receives the face of all men as his friend, and I myself shall accept him as my friend, the one who is before my Father in heaven.

Nꞌihi na Jọn bụ onye ahụ e kwuru ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Lee ana m ezite onyeozi m nꞌihu gị onye ga-edoziri gị ụzọ.’

For John is the one about whom the scripture says, 'See, I am sending my messenger before your face, who will prepare your way.'

Arịrịọ a wutere Herọd, nye ya nsogbu nꞌobi. Ma ebe ọ bụ na ọ ṅụrụ iyi nꞌihu ndị ọbịa ya nile, ọ chọghị ịla azụ nꞌokwu ya. O nyere iwu ka e meere ada ya ihe ọ chọrọ.

Herod's entreaty grieved him and troubled him. But since he swore in front of all his guests, he did not want to retract his words. He ordered that something be done to her daughter.

Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ na-ele Jisọs anya nꞌelu ugwu ahụ, mmadụ atọ ndị a hụrụ ka anụ ahụ Jisọs gbanwere. Ihu ya nwupụrụ ọcha dị ka akpụkpọ eluigwe. Uwe ya chakwara ọcha dị ka ogho.

While they are looking at Jesus on the mountain, the three people who see Jesus' body change. His face shone as white as the sky. His clothes were as white as snow.

Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ rịda, ha hụrụ igwe mmadụ nọ na ndagwurugwu ugwu ahụ na-eche ha. Otu nwoke sitere nꞌetiti igwe mmadụ ahụ bịakwute Jisọs gbuo ikpere nꞌihu ya, rịọọ ya sị,

When they came down the mountain they saw a crowd of people waiting in the valley below. A man from the crowd came to Jesus and knelt in front of him, and asked him,

“Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’

"But the man went down on his face at the king, and fell on his face, and begged the king, saying, 'Lord, be patient with me. And I will pay back all that I owe you. '

“Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’

“The man went down in front of him and asked for a moment. He also asked, 'Please my friend, be patient, and I will repay you what I owe you.'

Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere obodo Betfeji nke dị nꞌugwu Olivu. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa nꞌobodo nta dị nꞌihu ha.

As Jesus and his disciples approached Jerusalem, they came to the village of Bethphage in the Mount of Olives. While they were there, Jesus sent two of his disciples to the village that was in front of them.

Ọtụtụ nꞌime igwe mmadụ ahụ so Jisọs, tụsara uwe ha nꞌokporo ụzọ. Ndị ọzọ ghuturu alaka osisi, tụsaa ha nꞌụzọ, nꞌihu ya.

Most of the crowd followed Jesus, throwing their clothes on the road. Others cut down branches and threw them in front of him.

Ma o lepụrụ anya hụ otu osisi a na-akpọ fiigi ka ọ dị nꞌakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere ebe osisi ahụ dị, o jeruru nso nꞌukwu ya ịchọpụta ma ọ mịrị mkpụrụ. Ma ihe ọ hụrụ bụ nanị ahihia ndụ. Mkpụrụ ọ bụla adịghị nꞌelu ya. Ya mere, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.

But he looked around and saw a tree called Fiji on the side of the road. When he reached the tree, he went near it and found out if it had any fruit. But what he saw was only green grass. There is no seed on it. So Jesus cursed the tree and said, “From now on you will not bear anymore fruit!” At the same time, the tree withered.

Related Words
Near-By Words
íróenmity
íròfolktale
írétongue
ísìsmell