browsetext-to-speech

Want to know what "okwu" means in Igbo? View the translations below.

ókwú

Translates to
word 

noun

a unit of language that native speakers can identify
"words are the blocks from which sentences are made"
"he hardly said ten words all morning"
Sentences

Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.

After saying these words to Herod, the wise men departed. In fact, they saw the star again, the first one they had seen standing in the sky in Bethlehem.

Ebe ahụ ka ha nọgidere tutuu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nꞌọnụ onye amụma mezuo, “Ọ bụ site nꞌIjipti ka m kpọpụtara nwa m.”

There they remained until the death of Herod. This was fulfilled by the word of the Lord through the prophet, "I brought forth my son out of Egypt."

Nꞌoge mgbe ahụ, Jọn omee baptizim bidoro ikwusa okwu Chineke nꞌọzara Judia. Isi okwu ya bụ,

About this time John the Baptist began preaching the word of God in the wilderness of Judea. His theme is,

Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”

But Jesus said to him, "See, the Scripture tells us that the soul of man shall live, not by bread alone, but by the word of God."

Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.

Therefore, if anyone violates the lesser laws, and commands others to break them, that person will be counted in the least in the kingdom of heaven. But anyone who teaches someone to obey the law and keep God's word, he will be called great in the Kingdom of Heaven.

“Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu.

“When praying, do not say the same things as the rest do. They thought that God would hear their prayers because of their many words. Remember that before you make any request, your heavenly Father knows your needs.

“Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike.

“Everyone who obeys these words of mine, and does them, is like a wise man who built his house upon the rock-mass.

Obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke jụrụ ịnabata unu, ma ọ bụ ịnụ okwu unu, kụpụsịanụ aja nke obodo ahụ nꞌụkwụ unu mgbe unu na-ahapụ ya.

And any city or house that shall not receive you, or hear your words, shake off the dust of the city before it when ye leave it.

Ọ gaghị ese okwu, ma ọ bụ lụọ ọgụ. O nweghị onye ga-anụ oke okwu ya nꞌezi.

He will not quarrel, nor fight. No one will hear his powerful words.

Ezi mmadụ na-ekwupụta ezi ihe dị ya nꞌime obi. Ajọ mmadụ na-esitekwa nꞌajọ okwu ya kpughee ajọ ihe dị ya nꞌobi.

A good man declares what is in his heart; The wicked man also reveals his own wickedness by his wicked words.

Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru.

But I say unto you, That every idle word that men shall speak, they shall give account thereof in the day of judgment.

Nꞌihi na okwu unu kwuru ka a ga-eji kpee unu ikpe nꞌụbọchị ahụ, igosi unu dị ka ndị ikpe mara, ma ọ bụ dị ka ndị ikpe na-amaghị.”

For by the word that you have spoken you will be judged on that day, in order that you will be judged, or not guilty. ”

Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị Sheba ga-ebili boo unu ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na o si nꞌebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a, ma unu jụrụ ikwere na ya.

And on the day of judgment, the queen of Sheba will stand up against you. He will also condemn you. For he came from far away to hear the words of Solomon's wisdom; And now greater than Solomon is here, but you refuse to believe him.

Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara nꞌụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndụ nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya. Emesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nꞌobi.

The seed that is sown is the word of God. The field at which the seed drops is used to represent the heart. The lost seed, which the birds came to symbolize, represented life in the kingdom, but they did not understand it. Then the devil came and took away the words from them.

Mkpụrụ nke dara nꞌala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nꞌakụ nke ụwa, kpagidere okwu dị nꞌime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ.

The seed that falls on the thorns represents the heart of a person who hears the good news, but the desires of this world, coupled with the worldly spirit, interfere with the words in it, causing it to cease bearing fruit.

O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, nꞌihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site nꞌoge e kere ụwa.”

He fulfilled the words of the prophets, for they said, "I will speak to them in parables. And I will tell them things that no man ever knew.

Arịrịọ a wutere Herọd, nye ya nsogbu nꞌobi. Ma ebe ọ bụ na ọ ṅụrụ iyi nꞌihu ndị ọbịa ya nile, ọ chọghị ịla azụ nꞌokwu ya. O nyere iwu ka e meere ada ya ihe ọ chọrọ.

Herod's entreaty grieved him and troubled him. But since he swore in front of all his guests, he did not want to retract his words. He ordered that something be done to her daughter.

Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m!

Then Jesus called the people to him and said to them, “Listen to what I say. And understand my words!

Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judia, nke dị ma a gafee osimiri Jọdan.

After saying these words, Jesus departed from Galilee into the region of Judea, across the Jordan.

Okwu a Jisọs kwuru mere ka egwu tụọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”

Jesus' disciples were terrified by his words. They said, "If this is the way it is, who can be saved?"

Related Words
m̀kpàscissors
èkènégreeting
ńdípeople
Near-By Words