browsetext-to-speech

Want to know what "bia" means in Igbo? View the translations below.

-bịá

Translates to
come 

verb

move toward, travel toward something or somebody or approach something or somebody
"He came singing down the road"
"Come with me to the Casbah"
"come down here!"
"come out of the closet!"
"come into the room"
Sentences

Matiu, ọna ụtụ, bụ nwoke ahụ hapụrụ ọrụ ịna ụtụ ya soro Jisọs. Nꞌakwụkwọ nke ya o gosiri anyị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ụwa, onye ndị amụma Chineke gbara ama na ọ ga-abịa ọtụtụ afọ gara aga.

Matthew, a tax collector, was the man who left his tax duties to follow Jesus. In his book he shows us that Jesus is the Savior of the world, whom God's prophets warned would come many years ago.

“Ebee ka a nọ mụọ eze ọhụrụ ndị Juu ahụ? Anyị hụrụrị kpakpando ya nꞌọwụwa anyanwụ. Ugbu a anyị bịara ka anyị kpọọ isi ala nye ya.”

“Where is the new king of the Jews born? We saw his star in the east. Now we come to worship him. ”

Ma mgbe ọ hụrụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha bịara ka e mee ha baptizim, o bidoro ịkọcha ha sị, “Unu ụmụ ajụala, onye si unu gbanarị iwe Chineke nke na-abịa?

But when he saw the Pharisees and Sadducees coming for baptism, he began to accuse them, saying, “Ye offspring of vipers, who hath escaped from you the wrath of God?

Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.

I baptize only those who repent of their sins, but who is greater than I am coming. So much so that I was not even able to bear his shoes. He will baptize you with the Holy Spirit and fire.

Ma Jọn achọghị ime nke a. Ọ sịrị Jisọs, “Ọ bụghị m kwesịrị ime gị baptizim, gịnị mere i ji bịakwute m ka m mee gị baptizim?”

But John did not want to do this. He said to Jesus, "It is not right for you to be baptized. Why do you come to me to be baptized?"

Jisọs sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”

Jesus said to them, “Come with me. I'll make you fishers of men. ”

“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.

“Do not think that I have come to abolish the Mosaic Law, or to cancel the warning of the prophets. I did not come to cancel, but I came to fulfill them.

hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.

Abandon your gift of sacrifice and make peace with your brother. When you are safe, come back and give your gift.

Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.

Give it to everyone who asks for it. And do not bring back those who come to you for a loan.

Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe.

Thy kingdom come. Thy will be done, as in heaven.

“Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu.

“Be careful! Because there are false prophets. They come to you in sheep's clothing, but they are leopards. Their teachings can mislead you.

Mgbe Jisọs chọrọ ịbanye na Kapanọm, otu ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya nwoke, onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye nọkwa nꞌoge ahụ nꞌoke ihe mgbu.

When Jesus was about to enter Capernaum, a centurion came to him and asked him to come and heal his servant, who had been crippled, and was in pain.

Jisọs zara sị ya, “Aga m abịa.”

Jesus replied, "I will come."

Dị ka ọchịagha nke m bụ, ọ bụrụ na m asị onye agha nọ nꞌokpuru m bịa, ọ na-abịa, nꞌihi na ọ nọ nꞌokpuru m. Ma i nwere ike karịrị nke a ịchụpụ ọrịa ahụ na-enye ohu m nsogbu.”

As a commander I am, if I say to the soldier who comes under me, he comes because he is under me. But you can do better than that by removing my disease. ”

Nꞌezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro Eberaham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nꞌalaeze eluigwe,

In fact, many people from all over the world will come to associate with Abraham and Isaac and Jacob in the heavenly Kingdom,

Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ pụọ ịga nꞌihu nꞌije ya, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọ nꞌụlọ ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ịnakọta ụtụ. Jisọs kpọrọ ya sị ya, “Soro m bịa bụrụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ m.” Na-atụfughị oge Matiu hapụrụ ihe nile soro ya.

As Jesus left the place to go for his trip, he found a man named Matthew sitting in the house where he was working. Jesus invited him, saying, “Come with me to one of my disciples.” Not to miss the moment that Matthew left everything behind.

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.

Jesus asked them, “Should the friends of the bridegroom mourn and not eat the bread, while they are with the husband? There comes a time when I will be taken away from them, and then they will fast.

Mgbe Jisọs nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịara kpọọ isi ala nye ya sị ya, “Ọ dịbeghị anya kemgbe nwa m nwanyị nwụrụ. Ọ bụrụ na ị ga-abịa metụ ya aka ọ ga-ebili dịrịkwa ndụ ọzọ.”

While Jesus was talking, a ruler of the Jews came and worshiped him, saying, “It has been long since my daughter died. If you come and touch him, he will rise and live. ”

Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nꞌọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nꞌazụ bịaruo Jisọs nso, metụ ọnụ uwe ya aka.

But he had a weak woman. She has been living with the disease for 12 years. He also suffered from persistent hemorrhage. This woman from behind approached Jesus and touched the hem of his garment.

Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ nile na-abịakwute ya, o nwere ọmiko nꞌahụ ha, nꞌihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.

When he saw the crowds coming to him, he was moved with pity for them, because they were oppressed, having no helper, and they were as sheep without a shepherd.

Related Words
Near-By Words
-bútùbring down
-búdàbring down
-cháripen, colored
-chèthink