browsetext-to-speech

Want to know what "ka" means in Igbo? View the translations below.

kà1

Translates to
like 

preposition

Sentences

Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi.

When Jesus came up out of the water, behold, the heavens were opened, and John saw the Spirit of God descending on him like a dove upon Jesus.

Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.

You are the light of the world. You are like a city on a hill that cannot be hidden.

“Mgbe ọ bụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ịhụ abụọ, ndị na-ekpe ekpere nꞌakụkụ ụzọ na nꞌime ụlọ ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha nụkwa ekpere ha, kwuo na ha bụ ndị dị nsọ. Nꞌezie, otuto a bụ nanị ụgwọ ọrụ ha ga-anata.

“Whenever you want to pray, do not be like the two people who pray near the door and in the hall, where people will see them and hear their prayers and say that they are holy. Of course, this praise is their only reward.

“Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha.

“As for fasting, when you fast, do not be like the dead, or the hungry. This is what hypocrites do. They make their faces appear to be fasting. May this be a pity to them. Of course, the compassion that people have for them is really a reward.

Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a.

But I say to you that not even Solomon in all his glory was arrayed like these wild flowers;

“Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike.

“Everyone who obeys these words of mine, and does them, is like a wise man who built his house upon the rock-mass.

“Ma ndị nile nụrụ okwu ndị a, ma lefuo ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu aja.

“But as many as hear these things, and disregard them, are foolish. They are like the man who built his house upon the sand.

“Ana m ezipụ unu dị ka a ga-asị na ọ bụ atụrụ ka m na-ezipụ nꞌetiti agụ. Nweenụ uche dị ka agwọ.

“I am sending you forth as sheep in the midst of wolves. Treat yourselves like a serpent.

“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nꞌama, ndị na-asị ibe ha,

“To what can I liken the people of this generation? What do they look like? They are like little children who play with one another and say,

Jisọs tụrụ ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka onye ọrụ ubi nke kụrụ ezi mkpụrụ ọka nꞌubi ya.

Jesus told another parable, “The kingdom of heaven is like a farmer who sows fine seed in his field.

Jisọs tukwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nꞌubi ya. Ọ bụ ezie ha ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi nile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ aṅara

Jesus told them another parable: “The kingdom of the heavens has become like a grain that a farmer sowed in his field; Although they are the smallest of all seeds, they are as small as the ripe fruit

Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.

Also, Jesus likened the kingdom of heaven to a leaven of leaven, which a woman took and mixed with flour until the leaven leavened.

Ma ndị nile bụ ụmụ Chineke ga-enwụ dị ka anyanwụ nꞌime alaeze Nna ha. Ndị nwere ntị ịnụ ihe ha nụrụ.

But all of God's children will shine like the sun in their Father's kingdom. Those with ears to hear.

“Ala eze eluigwe dị ka akụ e zoro nꞌotu ibiribe ala, nke otu nwoke chọpụtara. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe nile o nwere, ma gaa zụọ ibiribe ala ahụ.

“The Kingdom of Heaven is like a treasure hidden in the field, which a man found. This man gladly sold all his belongings, and went and purchased the land.

“Ọzọ kwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke onye ọkụ azụ wụnyere nꞌime mmiri, jiri ya jide azụ dị iche iche, ndị a na-eri eri na ndị a na-adịghị eri eri.

“Again, the kingdom of the heavens is like a dragnet, that a fisherman has cast into the sea, and he may catch fish of both the kindred and the unlearned.

Jisọs sịrị ha, “Ya mere, onye ozizi iwu Mosisi ọ bụla soro bụrụ onye na-eso ụzọ nke alaeze eluigwe, ga-adị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nꞌọba ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”

Jesus said to them, "Therefore every teacher of the law of Moses who is a disciple of the kingdom of the heavens shall be like a master of the house, bringing forth new things and old things."

Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nꞌihi na okwukwe unu nwere ehighị nne. Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke dịkarịsịrị nta, nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike nye ugwu a iwu sị ya, ‘Site nꞌebe a wezụga onwe gị,’ ọ ga-apụkwa.

Jesus answered them, “Because you have little faith. If you have a faith that is too small, like a mustard seed, you can command this mountain, 'From here on out,' and it will disappear.

“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.

“The kingdom of the heavens must be likened to a king who made a reckoning with his servants.

Nꞌihi na Jọn bịakwutere unu gwa unu ka unu chegharịa, lọghachikwute Chineke, ma unu ekweghị. Ndị ọnaụtụ, na ụmụ nwanyị akwụla chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ ha, nke a emekwaghị ka unu chegharịa kwere.”

Because John came to you and told you to repent, and to turn to God, and you did not believe. Tax collectors, and paid women repented. Even when you do see them, you are less likely to repent. ”

Nke a bụkwa ilu ọzọ: “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke bụ eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwụnye, nꞌihi ọkpara ya.

Here is another proverb: “The kingdom of the heavens has become like a man, a king, that brought forth a marriage feast, because of his firstborn.

Related Words
túpúbefore
Near-By Words

-kà2

Translates to
guess 

verb

judge tentatively or form an estimate of (quantities or time)
"I estimate this chicken to weigh three pounds"
Sentences

Nꞌeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nꞌụbọchị ikpe karịa obodo ọjọọ nke Sodọm na Gomora.

In fact, it will be worse for the city on the day of judgment than for the wicked cities of Sodom and Gomorrah.

Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.

But I say to you, If you are angry with your brother, you will judge him by the judgment. And if you call your brother a fool, or a fool, you are offering yourself hell.

Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.

Because you will be judged as you judge others. The same can be said of others.

Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’

On that day of judgment many will say to me, 'Lord, Lord, we have preached the good news in your name.' And in thy name have we cast out devils, and do many signs.

“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.

“Do not judge others, and you may not be judged.

Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị Sheba ga-ebili boo unu ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na o si nꞌebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a, ma unu jụrụ ikwere na ya.

And on the day of judgment, the queen of Sheba will stand up against you. He will also condemn you. For he came from far away to hear the words of Solomon's wisdom; And now greater than Solomon is here, but you refuse to believe him.

Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ndị Ninive ga-ebili kpee unu ikpe. Ha ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ha chegharịrị, tụgharịa, bịakwute Chineke, ma ugbu a onye karịrị Jona ukwuu nọ nꞌebe a ma unu achọghị ya.

19 On the Judgment Day the people of Nineveh will stand up to judge you. And they will certainly condemn you. Because when Jonah spoke to them, they repented, turned to God, and now greater than Jonah is here, if you do not want him.

Nꞌezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.

Verily I say unto you, It shall be more tolerable for you in the day of judgment, than for the cities of Tire and Sidon.

Nꞌezie, ọ ga-adịrị gị njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sodọm.”

In fact, you will be worse off in the day of judgment than in the town of Sodom. ”

Nꞌihi na okwu unu kwuru ka a ga-eji kpee unu ikpe nꞌụbọchị ahụ, igosi unu dị ka ndị ikpe mara, ma ọ bụ dị ka ndị ikpe na-amaghị.”

For by the word that you have spoken you will be judged on that day, in order that you will be judged, or not guilty. ”

Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru.

As ye say, if I cast out the devil by the power of the devil, by whom do your sons cast them out? Therefore, it is your children who will be judged by you.

Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.

For I am the Son of man coming in the glory of my Father with me and my angels. Then I will judge everyone according to his works.

Related Words
Near-By Words