browsetext-to-speech

Want to know what "ju" means in Igbo? View the translations below.

-jụ́

Translates to
ask 

verb

direct or put; seek an answer to
"ask a question"
Sentences

A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị,

Jesus was born in Bethlehem of Judea in the time of Herod. Then the wise men from the east came in and asked,

Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”

Herod called the chief priests and the teachers of the law and asked them, "Where do the prophets say that the Savior will be born?"

Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụọ ha oge ha hụrụ kpakpando ahụ.

Herod secretly called the wise men and asked how they had seen the star.

O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ, onye ifufe na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”

The disciples were amazed and asked, "What sort of man is this, who is doing the things that he commanded?"

Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha tiri mkpu bido na-ajụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupuu i bido ịta anyị ahụhụ?”

When they saw Jesus, they began to ask Jesus, saying: “What have we to do with you and with you, God's Son? Won't you think it's time to start punishing us? ”

Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ jụrụ ha ajụjụ sị ha, “Gịnị mere echiche ọjọọ ji jupụta unu obi?

But Jesus, knowing their thoughts, asked them, “Why are you troubled?

Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”

When the Pharisees saw Jesus eat with these men, they asked his disciples, "Why does your master eat with tax collectors and sinners?"

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.

Jesus asked them, “Should the friends of the bridegroom mourn and not eat the bread, while they are with the husband? There comes a time when I will be taken away from them, and then they will fast.

Ha sooro Jisọs bata nꞌụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kweere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị kweere.”

They followed Jesus into the house where he was. He asked them, “Do you believe that I can see you?” They answered, “Yes, Lord, we believe.”

Ma onye ọ bụla jụrụ m nꞌihu mmadụ nile, mụ onwe m ga-ajụkwa ya nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe.

But whosoever shall deny me before all men, I also will ask him before my Father which is in heaven.

Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ileta Jọn gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị?

When the messengers of John had left, Jesus began to speak to the crowds about John. He asked them, “When you went into the wilderness to see John, what did you expect to see? A reed shaken by the wind?

Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?”

Here he saw a man with a withered hand. Those around him asked him, "Is it right to heal on the Sabbath?"

Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nꞌilu?”

Then the disciples came to him and asked, "Why do you speak to these people in parables?"

Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ laghachiri nꞌobodo Nazaret, gaa izi ndị mmadụ ihe nꞌime ụlọ ekpere. Amamihe ya na ọrụ ebube ọ rụrụ juru onye ọ bụla anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a nile?

When Jesus had finished saying these things, he returned to the city of Nazareth and taught in the synagogues. Everyone was amazed at his wisdom and his miracles. They asked one another, “Where did he get this wisdom? Where did he get all these miracles?

Nwagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya ihe ọ ga-arịọ nna ya. Mgbe nne ya gwasịrị ya ihe ọ ga-arịọ, ada Herọd lọghachiri gwa nna okwu sị ya, “Achọrọ m ka i nye m ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.”

The woman went to her mother and asked what she should ask for her father. After giving his mother a request, Herod's daughter returned and spoke to the father, saying, "I want you to give me now, in a dish, the head of John the Baptist."

Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nꞌomenala ndị okenye anyị? Tupuu mmadụ erie nri, ọ bụ omenala anyị na onye ahụ ga-ebu ụzọ kwọọ aka. Ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme nke a.”

They asked him, “Why do your disciples not obey the tradition of our elders? Before a person eats, it is our custom to wash the hands of the person first. But your disciples don't do this. ”

Jisọs jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ na ị ghọtaghị? Ọ̀ ga-abụ na o nweghị ihe dị iche nꞌetiti gị na ha nꞌịghọta eziokwu?

“Do you not understand?” Jesus asked. Is it not true that there is no difference between you and them who know the truth?

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nri unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe beredi asaa na azụ ole na ole.”

Jesus asked them, “What is your food?” They replied, “Seven loaves and some fish.”

Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”

When Jesus came to the city of Caesarea Philippi, he asked his disciples, “Who do people say that I am?”

Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye kwanụ ka unu onwe unu na-eche na m bụ?”

But Jesus asked them, “You, though, who do you say I am?”

Related Words
-kwúspeak
-sụ́speak
-nyégive
Near-By Words