browsetext-to-speech

Want to know what "nye" means in Igbo? View the translations below.

-nyé

Translates to
give 

verb

transfer possession of something concrete or abstract to somebody
"I gave her my money"
"can you give me lessons?"
"She gave the children lots of love and tender loving care"
bestow
"give homage"
"render thanks"
Sentences

Ha jeruru Betilehem, banye nꞌụlọ ebe nwantakịrị ahụ na nne ya nọ, daa nꞌala kpọọ isi ala nye nwa ọhụrụ ahụ. Ha meghere akpa ha nye ya onyinye ọlaedo, ọkpụrụkpụ eso osisi abụọ na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na maar.

They went to Bethlehem, went to the house with the child, and went down on their faces to the child. They opened their bags and presented him with a golden gift, a pair of fragrant frankisens, along with a marble.

Ọ sịrị Jisọs, “Aga m enye gị ha nile ma ọ bụrụ na ị daa nꞌala kpọọ isi ala nye m.”

He said to Jesus, "I will give it all to you if you fall down and worship me."

Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè.

People do not light a lamp and put it under a box, but on a stand, to give light to everyone in the house.

“Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo,

“If you go to offer your gifts in the temple, and remember that you are not at peace with your brother,

hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.

Abandon your gift of sacrifice and make peace with your brother. When you are safe, come back and give your gift.

Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

But listen to the law I give. Every man who separates himself from his installation, which he has not kept in the place of fornication, has committed sin, because he puts the woman in a state of fornication. If the woman marries again, the man who marries her commits adultery.

Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị.

If someone sues you in court, get your underwear and give it to you.

Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.

Give it to everyone who asks for it. And do not bring back those who come to you for a loan.

Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha.

Do not blow a trumpet when you give to the poor; They want people to praise them.

Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu.

Instead, when you want to pray, go into your room and close the door, pray to God your Father in secret. He knows the secrets of your heart. He will also answer your prayers and give you the reward you deserve.

Nye anyị nri nke ụbọchị taa.

Give us today our bread for this day.

Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

And he will give you all these things, if you will first give to him, and keep on living according to his will.

“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ.

“Do not give what is holy to dogs. Do not give good value. They will trample on and fight.

Ọ bụrụ na nwantakịrị arịọọ nna ya beredi, ọ ga-enye ya nkume?

If a boy asks for a father, will he give him a stone?

Ọ bụrụkwa na ọ rịọọ ya azụ, ọ ga-enye ya agwọ?

And if he asked a favor, would he give him a serpent?

Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya.

Since you sinners can give good gifts to your children, your heavenly Father will give you more, if you ask him.

Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.”

Jesus commanded the man, “Go to the chief priest, and tell no one on the way. Take your gifts along the way as stated in the Mosaic Law. Go see the chief priest, and tell the people that you are clean. ”

Mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe Jisọs mere, akpata oyi pụrụ ha nꞌahụ nꞌihi egwu. Ha toro Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ike dị otu a.

When many people see what Jesus did, they may be shocked. They praise God, who gives such power to humans.

Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya ike ime ihe ndị a nile.”

But the Pharisees said, "He is a devil, the prince of devils gives him power to do all these things."

A ga-ekpe unu ikpe nꞌihu ndị na-achị achị na nꞌihu ndị eze nꞌihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. Ee, nke a ga-enyere unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị ụwa.

You will be judged before the governors and the kings because of me. But this will give you the opportunity to tell them something about me. Yes, this will give you an opportunity to witness about me to the world.

Related Words
Near-By Words