browsetext-to-speech

Want to know what "kwu" means in Igbo? View the translations below.

-kwú

Translates to
speak 

verb

express in speech
"She talks a lot of nonsense"
"This depressed patient does not verbalize"
Not to be Confused With
kwùmore
Sentences

Ma ọchịagha ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Ekwesịghị m ka ị bata nꞌụlọ m. Nanị nọdụ nꞌebe a kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa ohu m nwoke ike.

But the officer spoke to Jesus and said, “I do not need you to come into my house. Just sit here and speak, and my servant will feel fine.

Mgbe Jisọs nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịara kpọọ isi ala nye ya sị ya, “Ọ dịbeghị anya kemgbe nwa m nwanyị nwụrụ. Ọ bụrụ na ị ga-abịa metụ ya aka ọ ga-ebili dịrịkwa ndụ ọzọ.”

While Jesus was talking, a ruler of the Jews came and worshiped him, saying, “It has been long since my daughter died. If you come and touch him, he will rise and live. ”

Mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a na ndụ anyị nile.”

When Jesus expelled the demon, the mute started to speak. Crowds died in the crowd. They said, "We have never seen anything like this in our lives."

Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nꞌonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nꞌigwe ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu.

For you are not to speak freely. But the Spirit of your Father who is in heaven will speak to you.

Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ dị ndị ekpenta ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, kwuokwa okwu ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ Jọn ihe banyere ozi ọma a na-ezisara ndị ogbenye.

Tell him that the blind are made to see, and the lame to walk. The lepers were also made well. The deaf hear and the dead speak. Tell John the good news of the good news to the poor.

Nꞌihi na tupu Jọn abịa, Mosisi na ndị amụma nile kwuru okwu banyere alaeze a.

Because before John came, Moses and all the prophets talked about this kingdom.

Emesịa, ha kpọtaara Jisọs otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Jisọs gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ. O mekwara ka o bido ikwu okwu.

Later they bring Jesus a blind and deaf man. He is also a troubled demon. Jesus healed him, and he restored sight to the man. It also made her start talking.

Ụmụ ajụala, olee otu ndị dị njọ dị ka unu ga-esi kwuo okwu ọma? Nꞌihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nꞌobi pụta.

Dear children, how bad are you as you say goodbye? For what a man says is what comes out of his mouth.

Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru.

But I say unto you, That every idle word that men shall speak, they shall give account thereof in the day of judgment.

Ana m agwa ha okwu nꞌilu nꞌihi na ọ bụ ezie na ha nwere anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa ezie na ha na-anụ ihe m na-ekwu ma ha adịghị aghọta ya.

I speak to them in parables because though they have eyes, they do not see. And even though they hear what I say, they don't understand it.

Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-agwa unu sị, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe ndị a anya unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe ndị a ntị unu na-anụ, ma ha enweghị ike.

For I speak to you the truth, that many prophets and righteous men longed to see these things which ye now see, and to hear the things which are in your ears. meat, but they cannot.

O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, nꞌihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site nꞌoge e kere ụwa.”

He fulfilled the words of the prophets, for they said, "I will speak to them in parables. And I will tell them things that no man ever knew.

“Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị,

“Hypocrites! Isaiah's prophecy about you is true. For God speaketh from it, saying,

Ọ tụrụ mmadụ nile nꞌanya mgbe ha hụrụ na ndị ogbi nile bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ. O jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izirel.

All the people were amazed to see that all deaf people began to speak. And when they saw that the people were healed, their feet were healed. They were also surprised to see that the lame walked, and the blind could see. They praised the God of Israel.

Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs na-agwa ha. Ha chere na ọ na-ekwu okwu a nꞌihi na ha chefuru iweta nri ha ga-eri.

But the disciples do not understand what Jesus is saying to them. They thought he was talking about this because they forgot to bring food to eat.

Gịnị mere unu ji chee na ọ bụ ihe banyere nri ka m na-ekwu? Ka m kwuokwa okwu m kwuru ọzọ, cheenụ onwe unu nche nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”

Why do you think I am speaking about food? And let me speak again, beware of the leaven of the Pharisees and of the Sadducees. ”

Na mberede, mgbe ha nọkwa na-ele ya anya, ha hụrụ Mosisi na Ịlaịja ka ha bịara soro Jisọs na-ekwurita okwu nꞌelu ugwu ahụ.

Suddenly, as they were gazing at him, they saw Moses and Elijah talking with Jesus on the mountain.

Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka Jisọs na-ekwu ihe banyere ya.

Then the disciples understood that he was speaking about John the Baptizer.

Related Words
Near-By Words