browsetext-to-speech

Want to know what "gwa" means in Igbo? View the translations below.

-gwá

Translates to
tell 

verb

express in words
"He said that he wanted to marry her"
"tell me what is bothering you"
"state your opinion"
"state your name"
let something be known
"Tell them that you will be late"
give instructions to or direct somebody to do something with authority
"I said to him to go home"
"She ordered him to do the shopping"
"The mother told the child to get dressed"
Sentences

Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.

After saying these words to Herod, the wise men departed. In fact, they saw the star again, the first one they had seen standing in the sky in Bethlehem.

Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.”

After the wise men left, Joseph received a vision of God's angel in a dream. He told Joseph, “Get up and take the young child and its mother and flee into Egypt. Don't come back until I tell you, because Herod wants to kill this little girl. ”

Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”

But Jesus said to him, "See, the Scripture tells us that the soul of man shall live, not by bread alone, but by the word of God."

Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ?

How can you tell him, 'Brother, allow me to cast a piece of straw for you,' when the grass is too big for you, and you cannot see?

gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Lee na mkpụrụ obi a ga-eritere Chineke nꞌuru dị ukwuu. Ma ndị ga-ezisa ozi ọma bụ nanị mmadụ ole na ole.

He spoke to his disciples, saying: “See how much this soul has to bear. But the good news is only a few.

A ga-ekpe unu ikpe nꞌihu ndị na-achị achị na nꞌihu ndị eze nꞌihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. Ee, nke a ga-enyere unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị ụwa.

You will be judged before the governors and the kings because of me. But this will give you the opportunity to tell them something about me. Yes, this will give you an opportunity to witness about me to the world.

“Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nꞌelu ụlọ tisasịa ya.

“What I say to you in the dark, say in the light of the night. What I quietly bring you to my ears, sit on the floor to break it down.

Jisọs gwara ndị ahụ Jọn zitere okwu sị, “Laghachikwanụ azụ gwa Jọn ihe banyere ọrụ ebube unu hụrụ m na-arụ.

Jesus told the messengers: “Go back and tell John about the miracles you perform.

Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ dị ndị ekpenta ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, kwuokwa okwu ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ Jọn ihe banyere ozi ọma a na-ezisara ndị ogbenye.

Tell him that the blind are made to see, and the lame to walk. The lepers were also made well. The deaf hear and the dead speak. Tell John the good news of the good news to the poor.

Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ gwara anyị na eze Devidi na ndị enyi ya mere mgbe agụụ gụrụ ha?

But Jesus answered them, “Haven't you read what the Scriptures tell us that King David and his friends did when they were hungry?

Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọ nsọ ukwu Chineke nọ nꞌebe a.

But I tell you that a greater than the temple of God is here.

“Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara.

“Therefore I say to you, that all sins, or any blasphemies, shall be forgiven them. But anyone who blasphemes the Holy Spirit will not receive forgiveness.

Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru.

But I say unto you, That every idle word that men shall speak, they shall give account thereof in the day of judgment.

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs okwu sị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ọrụ ebube ọzọ.”

Then some of the teachers of the law and the Pharisees spoke to Jesus, saying: “Teacher, we want to show you another miracle.”

Ana m agwa ha okwu nꞌilu nꞌihi na ọ bụ ezie na ha nwere anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa ezie na ha na-anụ ihe m na-ekwu ma ha adịghị aghọta ya.

I speak to them in parables because though they have eyes, they do not see. And even though they hear what I say, they don't understand it.

O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, nꞌihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site nꞌoge e kere ụwa.”

He fulfilled the words of the prophets, for they said, "I will speak to them in parables. And I will tell them things that no man ever knew.

Nwagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya ihe ọ ga-arịọ nna ya. Mgbe nne ya gwasịrị ya ihe ọ ga-arịọ, ada Herọd lọghachiri gwa nna okwu sị ya, “Achọrọ m ka i nye m ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.”

The woman went to her mother and asked what she should ask for her father. After giving his mother a request, Herod's daughter returned and spoke to the father, saying, "I want you to give me now, in a dish, the head of John the Baptist."

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn omee baptizim nụrụ otu o si nwụọ, ha bịara buru ozu ya gaa lie ya. Emesịa, ha gara gwa Jisọs ihe nile dị ka o si mee.

When the disciples of John the Baptist heard his death, they took his body and buried it. Then they go and tell Jesus everything that he has done.

Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbụ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.

After this, Jesus tells his disciples to get into the boat and start across the river. But he himself sat for sending the people.

Otu ụbọchị, ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara Jisọs sị ya, “Gosi anyị ihe ịrịba ama si nꞌelu, nke ga-ezi anyị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.”

One day the Pharisees and the Sadducees came to Jesus to tempt him. They said to Jesus, "Show us a sign from the sky that will tell us who you are."

Related Words
èkènégreeting
-kènèthank, greet
m̀kpàscissors
íròfolktale
-sụ́speak
-báchastise
ńdípeople
Near-By Words