browsetext-to-speech

Want to know what "ko" means in Igbo? View the translations below.

-kọ́

Translates to
tell 

verb

narrate or give a detailed account of
"Tell what happened"
"The father told a story to his child"
Sentences

Akwụkwọ ozi ọma anọ malitere Tesitamenti Ọhụrụ kọrọ akụkọ otu Jisọs Kraịst si bie ndụ Ya nꞌụwa. Akwụkwọ anọ ndị a gosiri anyị ụzọ anọ ndị ozi Kraịst si hụ ma ghọta obibi ndụ Kraịst ahụ.

The four Gospels that start the New Testament tell the story of how Jesus Christ lived. These four books show four ways in which the apostles of Christ saw and understood the life of Christ.

Luuku, onye dibia, kọwaara anyị nꞌakwụkwọ ozi nke ya otu Jisọs siri hụ ndị ọria, na ndị na-enweghị ike nꞌanya.

Luke, a physician, tells us in his letter how Jesus saw the sick, and the blind.

Jọn, onye ọkụ azụ, bụ onye naara anọ Jisọs nso mgbe nile. Nꞌakwụkwọ ya ọ kọwaara anyị ụdị ihunanya Jisọs nwere nꞌebe mmadụ nile nọ; ọ kọrọ akụkọ gosiri anyị ike dị ukwuu Jisọs nwere, na ọrụ ebube nile ọ rụrụ, si otu a kpugheere anyị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nꞌezie.

John, a fisherman, was always close to Jesus. In his book he describes the love that Jesus had for all people; it tells us the great power of Jesus, and the miracles he performed, thus revealing to us that Jesus is the true Son of God.

Mmadụ anọ ndị a nꞌotu nꞌotu kọwakwara otu ndị mmadụ si napụ Kraịst ndụ ya nꞌike, na otu e si kpọgide Jisọs Kraịst, onye hụrụ ndị iro ya nꞌanya nꞌobe. Ha kọrọ akụkọ nhuju anya Kraịst nꞌelu obe, na akụkọ ọnwụ ọ nwụrụ, nꞌihi mmehie mmadụ nile; kọọkwa akụkọ olili ya, na otu o si site nꞌọnwụ bilie ọzọ mgbe ụbọchị atọ gasịrị.

The four members also describe how the people of Christ took away His life, and how Jesus Christ, who loved His enemies, was crucified. They reported the sufferings of Christ on the cross, and the account of his death, for the sins of all men; and tell his story of his burial, and how he rose again from the dead three days later.

Mgbe ndị amamihe a chọrọ ịlaghachi obodo ha, ha esikwaghị Jerusalem ịkọrọ Herọd ihe ha hụrụ. Nꞌihi na Onyenwe anyị nyere ha iwu na nrọ sị ha site ụzọ ọzọ laa.

When the wise men wanted to return to their own city, they did not go back to Jerusalem to tell Herod what they had seen. Because the Lord had commanded them in a dream to tell them to go the other way.

Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.”

Jesus commanded the man, “Go to the chief priest, and tell no one on the way. Take your gifts along the way as stated in the Mosaic Law. Go see the chief priest, and tell the people that you are clean. ”

A kọrọ akụkọ ọrụ ebube a nꞌebe nile nꞌobodo ahụ.

The story of this miracle is reported everywhere.

“Ugbu a geenụ ntị mgbe m na-akọwara unu ihe banyere ilu onye ọrụ ubi ahụ nke gara ghaa mkpụrụ nꞌubi ya.

“Listen now as I tell you the parable of the farmer who went out to sow his seed in the field.

Ma mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ tutuu ruo mgbe o siri nꞌọnwụ bilie.

And as they were coming down from the mountain, Jesus commanded them that they should tell no one what they had seen until he had risen from the dead.

Related Words
Near-By Words