browsetext-to-speech

Want to know what "ajuju" means in Igbo? View the translations below.

ájụ̀jụ́

Translates to
question 

noun

an instance of questioning
"there was a question about my training"
"we made inquiries of all those who were present"
a sentence of inquiry that asks for a reply
"he asked a direct question"
"he had trouble phrasing his interrogations"
Sentences

A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị,

Jesus was born in Bethlehem of Judea in the time of Herod. Then the wise men from the east came in and asked,

Ajụjụ ha wutere Herọd nke ukwuu. O jukwara ndị nile bi na Jerusalem anya.

Herod was deeply disturbed by their questions. Everyone living in Jerusalem is amazed.

O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ, onye ifufe na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”

The disciples were amazed and asked, "What sort of man is this, who is doing the things that he commanded?"

Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha tiri mkpu bido na-ajụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupuu i bido ịta anyị ahụhụ?”

When they saw Jesus, they began to ask Jesus, saying: “What have we to do with you and with you, God's Son? Won't you think it's time to start punishing us? ”

Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ jụrụ ha ajụjụ sị ha, “Gịnị mere echiche ọjọọ ji jupụta unu obi?

But Jesus, knowing their thoughts, asked them, “Why are you troubled?

Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”

When the Pharisees saw Jesus eat with these men, they asked his disciples, "Why does your master eat with tax collectors and sinners?"

Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha, ọ zara sị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma. Kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibia na-akpa.

On hearing their question, Jesus answered them, “Those who are strong have no need of a physician. Rather, it is only those who are vulnerable.

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.

Jesus asked them, “Should the friends of the bridegroom mourn and not eat the bread, while they are with the husband? There comes a time when I will be taken away from them, and then they will fast.

Ha sooro Jisọs bata nꞌụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kweere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị kweere.”

They followed Jesus into the house where he was. He asked them, “Do you believe that I can see you?” They answered, “Yes, Lord, we believe.”

Jọn omee baptizim nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile Jisọs na-arụ, o ziri ndị na-eso ụzọ ya ozi ka ha gaa jụọ Jisọs ajụjụ sị,

John the Baptist was in prison at that time. When he heard about the miracles Jesus was doing, he dispatched his disciples to question Jesus, saying:

Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ileta Jọn gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị?

When the messengers of John had left, Jesus began to speak to the crowds about John. He asked them, “When you went into the wilderness to see John, what did you expect to see? A reed shaken by the wind?

Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?”

Here he saw a man with a withered hand. Those around him asked him, "Is it right to heal on the Sabbath?"

Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ laghachiri nꞌobodo Nazaret, gaa izi ndị mmadụ ihe nꞌime ụlọ ekpere. Amamihe ya na ọrụ ebube ọ rụrụ juru onye ọ bụla anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a nile?

When Jesus had finished saying these things, he returned to the city of Nazareth and taught in the synagogues. Everyone was amazed at his wisdom and his miracles. They asked one another, “Where did he get this wisdom? Where did he get all these miracles?

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị Juu si Jerusalem bịara ịjụ Jisọs ajụjụ.

Then some Pharisees and Jews from Jerusalem came to question Jesus.

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nri unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe beredi asaa na azụ ole na ole.”

Jesus asked them, “What is your food?” They replied, “Seven loaves and some fish.”

Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”

When Jesus came to the city of Caesarea Philippi, he asked his disciples, “Who do people say that I am?”

Pita zara ha sị, “Ee, ọ na-atụ ụtụ.” Ọ banyere nꞌụlọ ịgwa Jisọs banyere nke a. Ma tupuu Pita ekwuo ihe ọ bụla, Jisọs jụrụ ya ajụjụsị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Pita? Ọ̀ bụ nꞌaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ? Ọ̀ bụ nꞌaka ụmụ ha, ka ọ bụ nꞌaka ndị ọbịa e meriri emeri?”

Peter answered them, “Yes, it does pay.” He went home to tell Jesus about this. But Peter said nothing, and Jesus asked him, “What do you think about this Peter? From whom do the kings of the earth collect taxes? To their sons or to the conquered guests? ”

Nꞌoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ onye nꞌetiti anyị ga-enwe ọnọdụ dị ukwuu karịa ndị ọzọ nꞌalaeze eluigwe?”

Meanwhile, the disciples came to him and asked him, "Who of us shall have a place of greater honor than the others in the kingdom of heaven?"

Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?”

Then Peter came to Jesus and asked him, “Lord, how often shall I forgive my brother who has sinned against me? Seven times? ”

Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”

Some Pharisees came up to him to ask him the question, "Is it lawful for a man to put up with it and not look for me?"

Related Words
Near-By Words
ájọ̄bad, evil
ájị́hair, fur
áká ńnīright, right hand
áká ńrīright, right hand