browsetext-to-speech

Want to know what "zi" means in Igbo? View the translations below.

-zí

Translates to
teach 

verb

impart skills or knowledge to
"I taught them French"
"He instructed me in building a boat"
Sentences

Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.

And Jesus went about all the cities of Galilee, teaching in all the Jews. He preached the good news of the kingdom of heaven wherever he went. He also cured many diseases.

Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. O bidoro izi ha ihe sị,

And after he sat down, his disciples came to him. He started teaching them,

Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.

Therefore, if anyone violates the lesser laws, and commands others to break them, that person will be counted in the least in the kingdom of heaven. But anyone who teaches someone to obey the law and keep God's word, he will be called great in the Kingdom of Heaven.

“Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị.

“Let me warn you. If your righteousness is more evident than the righteousness of the Pharisees and the teachers of the law, you will certainly not inherit the kingdom of heaven.

Nꞌihi na Jisọs ziri ha ihe dị ka onye ike nile dị nꞌaka. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi ndị Juu.

Because Jesus taught them as much as possible. Not as Jewish teachers.

Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.”

But go find what the Scriptures want you to learn when it says, 'I do not commend you, but I want you to be merciful.' that the sinners may repent from their sins. ”

Jisọs jegharịrị nꞌobodo nile dị nꞌebe ahụ, ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche ndị mmadụ na-arịa.

Jesus went around the cities, large and small, teaching in the Jewish house of prayer. He is also preaching the good news of the kingdom. Wherever he went, he cured many kinds of ailments.

Nwanta akwụkwọ akarịghị onye ziri ya ihe. Ohu akarịkwaghị nna ya ukwu.

A schoolteacher is no more than an instructor. A slave was not greater than his master.

Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ, bido na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche izisa ozi ọma.

After giving these instructions to his disciples, Jesus withdrew from there and began to preach in the cities.

Emesịa, nꞌụbọchị ahụ kwa, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nꞌọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala na-ezi ndị mmadụ ihe.

Later that day, Jesus left the house and went to the boat and sat down to teach.

Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Jisọs nꞌezie, Pita pụtaziri gwa Jisọs okwu sị ya, “Onyenwe anyị, ebe ọ bụ gị nꞌezie, biko, nyenụ iwu nke ga-eme ka m bịakwute gị.”

When they saw that Jesus was really teaching, Peter said to Jesus, "Lord, if you are righteous, please put a command upon me to come to you."

Ma nꞌọnọdụ iwu a, unu na-ezi ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee ihe ọ ga-eji nyere ndị mụrụ ya aka, onye ahụ nwere ike ịjụ inyere ha aka ma ọ bụrụ na o kwuo na ihe ọ bụla o nwere bụ nke Chineke.’

But in the context of this rule, you teach people, 'If anyone has a reason to help their parents, that person can refuse to help if he says anything it belongs to God. '

Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ”

Their worship is in vain, for it is in the law of man that they teach the law of God. '”

Otu nwoke bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”

A man approached Jesus and asked, "Good teacher, what must I do to inherit eternal life?"

Emesịa, Jisọs lọghachiri nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, nọdụ nꞌebe ahụ na-ezi ihe. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Onye nyere gị ike i ji na-eme ihe ndị a nile ị na-eme?”

Then Jesus comes back to the temple and sits there to teach. The chief priests and the teachers of the law came to him and asked, "Who gave you the authority to do all these things?"

Ha kpebiri iziga ụfọdụ mmadụ ndị si nꞌotu Herọd. Ndị a bịara jụọ ya ajụjụ a, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu. Ị na-ezikwa eziokwu, na-echeghị echiche ihe ọjọọ ga-adakwasị gị. Ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya, nꞌihi na ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu.

They decided to send some men from Herod's palace. These visitors asked him: “Teacher, we know that you are honest. And you tell the truth, without thinking about what will happen to you. You also do not show partiality to anyone, for you do not show partiality.

Related Words
Near-By Words
-zèwatch out
-záanswer
-zàsweep
-zùrest